Obiangaeri. By Comrade Reginald Ifeanyi Chiekezi

Obiangaeri,
i chetara n'aka ka igba bia nga m n'izizi;
enweghi onye woro gi nri?
i chetara n'ala gwuru-agwu n'ezi
ebe anyi lere gi obia?

Obiangaeri,
i chetara na ndi oyi gi si anyi, 'anya saa,
na agu-buu-onu ka i bu?'
i chetara na anyi kwuru chim oge ha choro iji okwute tugbuo gi ka onye ohi?

Obiangaeri,
Ololo si na aha akporo ya ya efufe isi
abughi aha ya,
mere ojiri ji iwe wutuo n'osisi;
ma i ghoonaghi nke gi,
mere iji adakpu ala.

Obiangaeri,
i chetara na IKIRI ñuforo gi ara;
i huru ka ejiri nwugbuo ya?
Okwa onu a ijiri rikpo nri anyi
ka iji eri nsi?

Obingaeri,
Obiara nga anyi biara ibiagbu anyi;
Apari riri ihe aguru onu;
Okaka n'amaghi na mbido na ogwugwu
bu nwanne;
Eze ohi n'amaghi na nchigbu na odida
Kwu aga;
Anumanu yiri ihe ejiri koo ya onu!


By Comrade Reginald Ifeanyi Chiekezi 

Comments

Popular posts from this blog

20TH OCTOBER, 2025: THE DAY THAT PRESIDENTIAL INEXPERIENCE BROUGHT RESTIVENESS INTO THE FEDERATION CAPITAL TERRITORY. Written by KEMKA S. IBEJI

THE ANIMAL CALLED IDIOT AND THE MYOPIC MENTAL FACULTY OF OUR LEADERS. Written by Prince MacDonald Enwere

WHEN POLITICAL GAMES ENJOY COMMENTARIES OF WEAKLINGS AND THE TREACHEROUS: THE EYES OF THE MOST REASONABLE BECOME THE WATCH SCREENS. Written by KEMKA S. IBEJI